Ọkụkọ sịrị nà ịhé ọ bùlà á gbàtàrà n'izù dị yà mmá;yá mèrè izú jìrìkpébié nà ọ bụzị ọkụkọ kà á gà-éjì ná-àchụ àjà.
díòchì ánāghị èkwúchá ịhé níilē ọ hụrụ n'élú ńkwụ.
Ụbọchì ónyé óhī gà-àkwá ńnē yā kà ńd ị ngàjì há nà-éfū gà-àbíá mgbárú.
Ọkpá àkụ érī ērī nà ónyé ụbiàm bụ nwáńnē, mànà íhé ónyé ụbịàm jìrì kámmā bụ nà nkè ọ kpàtàrà ò ríé.
ódùdù ígù ánāghị àtụ nwá ńzā ēgwù, n'íhì nà ọ bụ ébé ńné nà ńnà yánọrọ tóó ōkōrō nà àgbọghọbịà.
ónyé é mèrè ịhé iwē, ọ ghàrá ịwẽ iwẽ, é méé yā ihê ọnụ, ọ gághị ānụọnụ.