-
Asụsụ Igbo
Igbo Amaka
-
Asụsụ Igbo
Ọjemba Enwe Ilo
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ
N'OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ III
NWAANYỊ ONYE SAMERỊA
(De Samaritana)
A na-ekpe nke a na Sọndee a gụrụ ozịọma banyere nwaanyị Samerịa, ma ọbụghị nke a, e were Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke oge ọpịpịa Ụbọchị Iri Ano I maọbụ II.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyi nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ,O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye,mgbe ọ rịọrọ nwaanyị Samerịa mmiri ọñụñụ,
E tinyelaarịị onyinye nke okwukwe n'ime ya.
Bịa nwee agụụ mmiri nke okwukwe ya
nke na Ọ mụnyere ọkụ nke ịhụnanya Chineke n'ime ya.
N'ihi nke a,
Anyị na-enye Gị ekele,
Sorokwa ndị Mmụọọma na-ekwupụta Ike Gị, na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
info@asusuigbo.net
support@asusuigbo.net
+234 913 361 9574
+234 813 797 9944
45 Chime Avenue New Haven Enugu, Nigeria.
143 Nike Rd. Abakpa Nike Enugu, Nigeria.