-
Asụsụ Igbo
Igbo Amaka
-
Asụsụ Igbo
Ọjemba Enwe Ilo
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
AHỤHỤỌNWỤ ONYENWEANYỊ I
IKE DỊ N'OBE
A na-ekpe nke a ma izuụka nke ise dị n'oge ọpịpịa Ụbọchị Iri Anọ gachaa, na n'ime Misa Iheomimi nke Obe, na kwa Ahụhụọnwụ Onyenweanyị.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa:
N'ihi na site n'ahụhụọnwụ nke Nwa Gị na-enye nzọpụta,
ụwa niile enwetala mmụọ iji kwupụta ebubeeze Gị.
A bịakwa site n'ike na-enweghị atụ nke Obe,
ikpe e kpere ụwa
na ike nke Onye a kpọgburu n'obe na-achawapụta.
N'ihi nke a,
O Oseburụwa, anyị na ndị Mmụọọma,
na ndị Nsọ niile ji mkpuọñụ,
na-ekwupụta otito Gị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
info@asusuigbo.net
support@asusuigbo.net
+234 913 361 9574
+234 813 797 9944
45 Chime Avenue New Haven Enugu, Nigeria.
143 Nike Rd. Abakpa Nike Enugu, Nigeria.