-
Asụsụ Igbo
Igbo Amaka
-
Asụsụ Igbo
Ọjemba Enwe Ilo
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ I
IHEOMIMI NGAFERE NA NKE NDỊ NKE CHINEKE
A na-ekpe nke a n'ụbọchị Sọndee niile na-adanyeghị n'oge emume pụrụ iche dị n'afọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye sitere n'iheomimi nke Ngafere
rụọ ọrụ a dị ịtụnanya :
ka e wee si na njọ na n'agbụ nke ọnwụ kpọpụta anyị,
bịa kpọbata anyị n'otito nke a,
nke mere e ji akpọ anyị ugbua, agbụrụ a họtara ahọta,
ndị ụkọchukwu nọ n'ọkwaeze, mba dị nsọ,
ndị a gbataara Gị.
Ka anyị bụ ndị I si n'ọchịchịrị kpọbata
n'ihe nke Gị dị ebube
na-ekwupụta akaọrụ Gị n'ebe niile.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma na ndịisi Mmụọọma,
ha na Ukpoeze, na Ikeọchịchị,
na kwa igwe ndịagha niile nke eluigwe,
na-ekwe ukwe otito Gị, akwụsịghị akwụsị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
info@asusuigbo.net
support@asusuigbo.net
+234 913 361 9574
+234 813 797 9944
45 Chime Avenue New Haven Enugu, Nigeria.
143 Nike Rd. Abakpa Nike Enugu, Nigeria.