-
Asụsụ Igbo
Igbo Amaka
-
Asụsụ Igbo
Ọjemba Enwe Ilo
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ III
NZỌPỤTA MMADỤ SITE NA MMADỤ
A na-ekpe nke a n'ụbọchị Sọndee niile na-adanyeghị n'oge emume pụrụ iche dị n'afọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa:
Anyị nabatara na ọ bụ njirimara otito Gị na-enweghị ube,
na I jiri Ịbụchukwu nke Gị
gbatara mmadụ pụrụ ịnwụ anwụ ọsọ enyemaka.
Ọ bụghị sọọsọ na I nyere anyị ọgwụgwọ
site n'ọnọdụ anyị ahụ nwere ike ịnwụ anwụ,
kama, I sitere n'ụdị áhụ anyị si na ya dafuo zọpụta anyị
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye igweagha ndị mmụọọma si na Ya
na-esekpuru ebubeeze Gị,
ndị nọ n'ihu Gị na-enwe ọñụ mgbe niile.
Anyị na-arịọ ka I kwe ka anyị tinyekọọ olu anyị na nke ha,
were otu olu na-eti mkpu ọñụ, na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
info@asusuigbo.net
support@asusuigbo.net
+234 913 361 9574
+234 813 797 9944
45 Chime Avenue New Haven Enugu, Nigeria.
143 Nike Rd. Abakpa Nike Enugu, Nigeria.