-
Asụsụ Igbo
Igbo Amaka
-
Asụsụ Igbo
Ọjemba Enwe Ilo
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ IV
AKỤKỌ NZỌPỤTA
A na-ekpe nke a n'ụbọchị Sọndee niile na-adanyeghị n'oge emume pụrụ iche dị n'afọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
N'ihi na, Ya onwe Ya sitere n'ọmụmụ Ya
mee ka ọnọdụ ochie mmadụ dị ọhụrụ;
site n'ahụhụ Ya hichapụ njọ anyị ;
site na mbilitenọnwụ Ya,
O mere ka ụzọ ndụ ebighịebi rute anyị aka;
sitekwa n'ịlaghachikwute Gị, Nna,
Ọ kwaghepụrụ ọnụụzọ eluigwe.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma na igwe ndị Nsọ
na-ekwere Gị ukwe otito ebighịebi,na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
info@asusuigbo.net
support@asusuigbo.net
+234 913 361 9574
+234 813 797 9944
45 Chime Avenue New Haven Enugu, Nigeria.
143 Nike Rd. Abakpa Nike Enugu, Nigeria.