-
Asụsụ Igbo
Igbo Amaka
-
Asụsụ Igbo
Ọjemba Enwe Ilo
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ VI
MBE NKE MBILITENỌNWỤ EBIGHỊEBI
A na-ekpe nke a n'ụbọchi Sọndee niile na-adanyeghị n'oge emume pụrụ iche dị n'afọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
Ọ bụ na Gị ka anyị na-adị ndụ na-agagharị,
bụrụkwa ihe anyị bụ.
Na ndụ anụahụ nke a,
Ọ bụghị naanị na anyị na-ahụ uru ọmịiko Gị ụbọchị niile,
kama anyị ejidegorịị mbe nke ndụ ebighịebi n'aka.
Ebe ọ bụ na anyị enwetala mkpụrụ mbụ nke Mmụọ ahụ,
nke I si na Ya kpọlite Jesu n'ọnwụ,
anyị nweziri nchekwube
na iheomimi nke Ngafere ebighịebi,
ga-abụ nke anyị.
N'ihi nke a,
anyị na-eso ndị Mmụọọma niile na-eto Gị,
were mmemme obiụtọ na-eti mkpuọñụ na-asi :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
info@asusuigbo.net
support@asusuigbo.net
+234 913 361 9574
+234 813 797 9944
45 Chime Avenue New Haven Enugu, Nigeria.
143 Nike Rd. Abakpa Nike Enugu, Nigeria.