-
Asụsụ Igbo
Igbo Amaka
-
Asụsụ Igbo
Ọjemba Enwe Ilo
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ VII
NZỌPỤTA SITERE NA NRUBEISI NKE KKRISTI
A na-ekpe nke a n'ụbọchị Sọndee niile na-adanyeghị n'oge emume pụrụ iche dị n'afọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
N'ihi na n'obi ebere Gị,
Ị hụchachara ụwa n'anya
nke na I ziteere anyị Onye Mgbapụta,
Onye sitere na nzube Gị,
were ụdi anyị n'ihe niile beeresọ ime njọ.
Ka Ị na-ahụ n'ime anyị,
otu ihe ahụ masịrị Gị n'ime Nwa Gị,
Onye anyị si na nrubeisi Ya
nweghachitekwa onyinye Gị
Nke anyị tufuru mgbe anyị mejọrọ site na nnupụisi.
N'ihi nke a,
O Dinwenụ, anyị na ndị Mmụọọma,
na ndi nsọ niile na-ekwupụta otito Gị,
were mkpuọñu na-asi :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
info@asusuigbo.net
support@asusuigbo.net
+234 913 361 9574
+234 813 797 9944
45 Chime Avenue New Haven Enugu, Nigeria.
143 Nike Rd. Abakpa Nike Enugu, Nigeria.