-
Asụsụ Igbo
Igbo Amaka
-
Asụsụ Igbo
Ọjemba Enwe Ilo
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME
MMIRICHUKWU E MERE ONYENWEANYỊ
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa:
I jiri iheomimi dị itụnanya
wee gosipụta mwụcha ọhụrụ n'osimiri Jọdan,
ka e wee kwenye na Okwu Gị binyeere mmadụ,
site n'olu ahụ si n'igwe daa;
sitekwa na Mmụọ Nsọ gbadatara n'ụdị nduru,
mata na e tere Kristi Nwaodibo Gị mmanụ ọñụ,
wee zipu Ya ka O bugara ndị ogbenye Oziọma.
N'ihi nke a,
anyị bụ ndị nọ n'ụwa na-eso ike niile nke eluigwe,
jiri mkpụọñụ na-etiku ebube eze Gị ebighịebi, na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
info@asusuigbo.net
support@asusuigbo.net
+234 913 361 9574
+234 813 797 9944
45 Chime Avenue New Haven Enugu, Nigeria.
143 Nike Rd. Abakpa Nike Enugu, Nigeria.