-
Asụsụ Igbo
Igbo Amaka
-
Asụsụ Igbo
Ọjemba Enwe Ilo
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME NKUBATA DINWENỤ
(FEB.2)
IHEOMIMI NKUBATA DINWENỤ
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa :
N'ihina, n'ụbọchị taa, Mmụọ Nsọ gosịpụtara na Nwa Gị
Onye Gị na Ya dị ebighiebi e kubatara n'ụlọnsọ,
Bụ ebube nke Izrel na Ὶhè nke mba niile.
N'ihi nke a,
anyị ji ọñụ na-ezute Onye Nzọpụta anyị,
soro ndị Mmụọọma na ndị Nsọ
na-eto Gị ebighịebi,na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
info@asusuigbo.net
support@asusuigbo.net
+234 913 361 9574
+234 813 797 9944
45 Chime Avenue New Haven Enugu, Nigeria.
143 Nike Rd. Abakpa Nike Enugu, Nigeria.