-
Asụsụ Igbo
Igbo Amaka
-
Asụsụ Igbo
Ọjemba Enwe Ilo
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME MGBANWE ỤDỊDỊ
(ỌGỌ.6)
IHEOMIMI MGBANWE ỤDỊDỊ
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
O kpugheere ndị akaebe a họọrọ ebube Ya
bịa wụkwasa ụdị Ahụ ahụ Ya na ndị ọzọ nwekọrọ
ebube dị egwu.
O mere nke a ka e wee wepụ ihe mkpọbiụkwụ dị n'Obe
n'obi ndị Apostụl Ya,
na kwa ka O wee gosipụta na ebube ahụ pụtárá ihe n'isi Nzukọ n'ụzọ
dị ịtụnanya ga-ezukwa ahụ ya niile.
N'ihi nke a,
Anyị bụ ndị nọ n'ụwa na-eso Ike niile nke eluigwe
na-ekwupụta otito Gị,
na-etiku ebubeeze Gị akwụsịghị akwụsị, na-asị:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
info@asusuigbo.net
support@asusuigbo.net
+234 913 361 9574
+234 813 797 9944
45 Chime Avenue New Haven Enugu, Nigeria.
143 Nike Rd. Abakpa Nike Enugu, Nigeria.