• Asụsụ Igbo

    Igbo Amaka
  • Asụsụ Igbo

    Ọjemba Enwe Ilo

.Na mmemme ụbọchị taa kachasị nsọ...

MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA

ỌMỤMỤ ONYENWEANYỊ II

IDOGHACHI IHE NILE N'IME MWEREAHỤ

36.  A na-ekpe nke a na Misa niile nke ụbọchi oriri Ọmụmụ Onyenweanyi na n'ụbọchị ọbụla n'ime izuemumeabaliasatọ ya. A na-ekpekwa ya n'ụbọchị ndị na-esote ya; ọbụladị na Misa ndị nwere Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha, beeresọ na Misa ndị nwere Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha metụtara iheomimi dị na Chukwu, maọbụ iheomimi nke Onweonye dị n'Otu Chineke; ya nakwa n'ụbọchi nkịtị dị n'oge mmemme Ọmụmụ Onyenweanyi.

V. Onyenweanyị  nọnyere ụnụ.

R. Nọnyekwara mmụọ gị.

V. Welite nụ obi ụnụ elu.

R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.

V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.

R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.

O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,

na nzọpụta anyị,

na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,

na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,

Chineke ji ike niile, Onye dį ụwatụụwa,

site na Kristi Dinwenụ anyị.

Onye a pụghị ihụ anya n'ụdị nke Ya

Gosịrị onwe Ya n'ụdị anyị a pụrụ ịhụ anya

n'iheomimi nke a kwesịrị nsọpụrụ anyị na-eri oriri Ya.

Onye a mụrụ tupu ụwatụwa, bidoro dịwa n'oge,

ka O site n'ibulite n'ime onwe Ya ihe niile dara ada,

wee weghachi okike niile n'ozuzuoke,

bịa kpọghachi mmadụ furu efu n'alaeze eluigwe.

N'ihi nke a,

Anyị na-eso ndị Mmụọọma niile

na-ekwe ukwe otito Gị n'emume obiụtọ na-asị :

Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...

Ọ bụrụ na a ga-ekpe Ekpere Yukarịstịa nke Rom, a ga-ekpekwa Ekpere Mmekọrịta Anyị na Ndị Nsọ

pụrụ iche dị ka o siri dị n'ihuakwụkwọ...

Na Misa Nche na nke Etitiabalị  ọmụmụ Dinwenụ, a ga-ekpe:...Na mmemme anyasị a kachasị nso...

Bidozie n'ụtụtụ ya na n'ime izuemumeabaliasatọ a, a ga-ekpe ...Na mmemme ụbọchị taa kachasị nsọ...

Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...

More...
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha.

More...
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha..

Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha….

More...

Vocabulary

Okwu Igbo

Vowels
Udaume
Parts of the body
Akụkụ ahụ mmadụ
Composition
Edemede
Food
Nri
Words
Okwu Igbo
High Tone
Ụdaelu
Low Tone
Ụdaala
Consonants
Mgbochiume
Transportation
Njem
Market Days
Ụbọsị Ahịa
Animal
Anụmanụ
Greetings
Ekele
Singular
Otu
Plural
Ọtụtụ
Countries
Obodo
Proverbs
Ilu

stay in touch

  • Email

    info@asusuigbo.net
    support@asusuigbo.net

  • Phone

    +234 913 361 9574
    +234 813 797 9944

  • Address

    45 Chime Avenue New Haven Enugu, Nigeria.
    143 Nike Rd. Abakpa Nike Enugu, Nigeria.