-
Asụsụ Igbo
Igbo Amaka
-
Asụsụ Igbo
Ọjemba Enwe Ilo
V. Mụọ ọma nke Osebụrụwa gwaputara Marịa
R. O were tụrụ ime site na Mụọ Nsọ
Ekene Marịa…
V. Lee odibo nwanyị nke Oseburụwa
R. Ka o rere m k’isi kwu.
Ekene Marịa…
V. Okwu e mere ahụ
R. O were binyere anyị
Ekene Marịa…
V. Rịọwara anyị arịrịọ o Nne nke Chukwu dị asọ
R. Ka e were mee anyị itosi nkwa nke Kristi.
Ayịyịọ
Anyi na-ario Gi, O Chukwu, ka I runye gratịa Gị n’ime obi anyị, ka anyi bu ndị Mụọ-ọma butere ozi, mata iwere ahụ Kristi Nwa Gị, were site n'ahụhụ Ya n'obe Ya, bata n'otito nke mbilite n'ọnwụ Ya, site n'otu Kristi ahụ Dinwenu anyị. Amịn. Enyemaka Chineke nọnyerekwa anyị mgbe dum. Ka mkpụrụ obi ndị nile kwerenụ gara aga site n’ebere nke Chukwu wee zuru ike na ndọkwa. Amịn.
info@asusuigbo.net
support@asusuigbo.net
+234 913 361 9574
+234 813 797 9944
45 Chime Avenue New Haven Enugu, Nigeria.
143 Nike Rd. Abakpa Nike Enugu, Nigeria.