• Asụsụ Igbo

    Igbo Amaka
  • Asụsụ Igbo

    Ọjemba Enwe Ilo

O Nne kwesịrị ịtụnaanya, were m nye Nnwa

O Amamiihe dị Ebeebe weere Ahụ O Jesu dịkarịsịrị ụtọ na ịhụnaanya. I bụ ezi Chukwu na ezi Mmadụ. Sọ otu Nnwa nke Nna dị Ebeebe na nke Marịa,

 Vejin ekpo niile, ewere mụ obi m niile fee gị. Onye ya na Nna nọ site na mgbe ebighi ebi. Efeekwa m Gị oge I sitere n'owuwe Ahu Gị nọrọ n'afọ Vejin Maria,
 bụ nne Gị kwesịrị ekwesị.
Ebunye m Gị ekele maka na I weere ụdị ohu, bịa laa onwe Gị n'iyi, ka I wee zọpụta m n'igba ohu ahụ m ji obi ojọọ agbaara Ekwensu. Etoo m Gị bịa doo Gị
 ebube n'ihi na I doro onwe Gị n'okpuru Nne Gị dị asọ, bụ Maria, bịa hubeere ya isi n'ihe niile dịka ọ sịrị bụrụ mmasị gị. I mere nke a ka ị wee mee m 
ezigbo ohu Gị site n'aka ya. Ma a bịazị, abụzị m onye na-enweghị obi ekele na onye akwụdosighi ike ma ncha. O dịghị kwee Gị oge m mere Mmirichukwu.
 O dịghị mgbe m mezuru ịhe ndị ahụ kwesịrịna m ga-eme.Ekwesịghị m ka a kpoo mụ nnwa Gị, ọbuladị ohu Gị, n'ihi na o dịghị ịhe ọbụla dị n'imem nke  
ekwesịghị iwe Gị na ọjụjụ gị. Apụghị m ịbịa nsọpụrụ. O bụ n'ihi nke a ka m jiri gbaba n'arịrịọ ekwuuru m n'ihu Gị. Echekwubere m isite
 n'aka mgbaghara njọ m niile, bịazị nweta amamiihe,na ikwudosi ike na ya.

Naraazị Ekele, O Marịa kasị ocha, ụlọ obibi dị ndụ nke Chukwu, n'ime gị ka Amamiihe dị Ebeebe kwenyere izobe Onwe ya ka ndị mmụọọma na ndị
 mmadụ wee fee ya. Nara Ekele,ngị onye bụ nchedo ndị njọ, onye obiebere ya anaghị agha idinyeere onye obụla chọro ya.
 Nụrụ agụụ ahụ m nwere n'ebe Amamiihe Chịneke ahụ nọ. N'ihi nke a, nara nkwa na onyinye nke m ji obi umeala egosiputa n'ihụ gị.
 Mụ bụ...A...onye njọ na-ekwesighi ntụkwasịobi, ji ụbochị taa na-ekwegharị nkwa nke Mmirichukwu m n'aka gị, bia na-ekwuputakwaazị įkwudosi ike na 
ha:ajụla mụ ekwensu, ihe nlafu ya niile, na ọrụ ya niile,ebeebe.

Ewere m onwe m niile nyefee n'aka Jesu Kristi,Amamiihe ahụ were Ahụ. Aga mụ eburu obe mụ ụbọchị niile nke ndụ m na-eso ya n'azụ, bịazi na-ehubeere ya
 isi karịarị ka m na-eme na mbụ.

N'ihu Ike niile nke eluigwe ka m nọ wee họro gị n'ụbọchị taa ka i 
buru Nne m na Onye mgbaziiri m.Ana mụ enye gị, bia na-edooro gị ihe ndị a dịka ohu gị: ahu na mkpụrụobi m, ihe niile m nwere,ka nke a na-ahụ anya, 
ka nke mmụọ, obụladị  erere  nke eziomume m niile, ka eziomume ndị gara aga, ndị ugbu a, na ndị ga-adị n'ihu. Ana my ahapụụrụ gị ike niile ka 
I were m na ihe niile m nwere, na-enweghị nke e wepụrụ, mere ịhe masịrị gị. Ya bụ,maka nnukwu otito nke Chukwu ugbu a na mgbe ebighi ebi.


O Vejin dị afọọma, naranụ obere onyinye nke a m nyere gị, bụ ịgbaara gị ohu. Nara ya n'iji sọpụrụ nhube isi ahụ, tinyeere n'ijikọ ya na nhube isi ahụ,
 nke Amamiihe dị Ebeebe jiri wedata Onwe ya n'ebe ịbụ nne gị nọ. Nara ya n'iji sọpụrụ ike ahụ nke unu abụọ nwere n'ebe onye njọ a nọ.Narakwaazi onyinye
 nke a n'iji nye ekele maka Onyinye ahu pugara iche nke Atọ n'ime Otu dị Ngọzị jiri meere gị ọgọ. Ana mu ekwuputa na sitezja ugbu a dịrịzịa gaba,
 na ọ masịrị mụ ịchọ ụzọ m ga-esi na-akwanyeere gị ugwu, bịazịa na-ehubeere gị isi n'ihe niile, dịka ezi ohu gị.

O Nne kwesịrị ịtụnaanya, were m nye Nnwa gị ya ebee narakwa m site n'aka gị, dịka O sitegoro n'aka gị  
wee gbapụta m. O Nne nke Ebere, meenu ka m ahụ. N'ihi nke a nabata m n'ime ụmụ gị, na ndị ndi Į na-edu, ndị Į na-azụ, na ndị Į na-echekwa.

O Vejin kwesịrị ntụkwasịobi, mee ka m bụrụ onye zuru oke n'ibu nwaazụ, onye □lomi, na ohu nke Amamiihe were Ahụ, bụ Jesu Kristi, Nnwa gị,n'ihe
 niile. Ya bụ, site n'arịrịọ gị na eziomume gị echekwubere ibi ndụ ka ya n'ụwa a bịazị nweta otio ya n'Eluigwe. Amen.

Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha..

More...
Ahụrụ m Gị na-anya karịcha ịhe nile

Ahụrụ m G

More...
O Chukwu nke m, o wutere m n'obi

More...
Jesu, Marịa ahụrụ m unu n'anya, zopụtanị

More...
Beti Petiit bụ onye nwere obi umeala.

More...
O Nne kwesịrị ịtụnaanya, were m nye Nnwa

More...
Ọ dị mkpa nke ukwuu Jesu Kristi Eze

More...
Nkwụsi nke Iri na Atọ

More...
.Aga Mụ enye ha amara ahụ nke

More...
Anyị chekwubere ịnwetazu ịhe

More...
Ka Aha Chineke kasị dị Asọ - kasị

More...
Sitere n'aka Teriza di asọ nke Nnwa

More...
Aririọ n'Ihu Obe Dị Asọ

More...
Mkpụrụobi Kristi, doo m nsọ.

More...
Nna dị Ebeebe, anyị ejiri obi umeala

More...
Mkpụrụobi ndi na-esi na Pọgatri

More...

Vocabulary

Okwu Igbo

Vowels
Udaume
Parts of the body
Akụkụ ahụ mmadụ
Composition
Edemede
Food
Nri
Words
Okwu Igbo
High Tone
Ụdaelu
Low Tone
Ụdaala
Consonants
Mgbochiume
Transportation
Njem
Market Days
Ụbọsị Ahịa
Animal
Anụmanụ
Greetings
Ekele
Singular
Otu
Plural
Ọtụtụ
Countries
Obodo
Proverbs
Ilu

stay in touch

  • Email

    info@asusuigbo.net
    support@asusuigbo.net

  • Phone

    +234 913 361 9574
    +234 813 797 9944

  • Address

    45 Chime Avenue New Haven Enugu, Nigeria.
    143 Nike Rd. Abakpa Nike Enugu, Nigeria.